15 Gị onwe gị maara.+ Jehova, biko, cheta m+ ma chee ihu n’ebe m nọ ma bọọrọ m ọbọ n’ahụ́ ndị na-akpagbu m.+ Ewepụla ndụ m n’ihi eweghị iwe ọsọ ọsọ gị.+ Mara na mụ onwe m eburuwo nkọcha n’ihi gị.+
11 Ma Jehova nọnyeere m+ dị ka dike dị egwu.+ Ọ bụ ya mere ndị na-akpagbu m ga-eji sụọ ngọngọ wee ghara imeri.+ Ihere ga-eme ha nke ukwuu, n’ihi na ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma. A gaghị echefu mmechuihu ha nke ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+