20 Ma Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ikpe n’ezi omume;+ ọ na-enyocha akụrụ na obi.+ Biko, ka m jiri anya m hụ ọbọ ị ga-abọ n’ahụ́ ha, n’ihi na ọ bụ gị ka m kọsaara okwu ikpe m.+
15 Gị onwe gị maara.+ Jehova, biko, cheta m+ ma chee ihu n’ebe m nọ ma bọọrọ m ọbọ n’ahụ́ ndị na-akpagbu m.+ Ewepụla ndụ m n’ihi eweghị iwe ọsọ ọsọ gị.+ Mara na mụ onwe m eburuwo nkọcha n’ihi gị.+
5 Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+