14 “Gịnị mere anyị ji nọdụ ala gba nkịtị? Zukọtanụ ka anyị banye n’obodo e wusiri ike+ ma nwụọ n’ebe ahụ. N’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị enyefewo anyị ka e bibie anyị.+ Ọ na-enye anyị mmiri e tinyere ihe na-egbu mmadụ ka anyị ṅụọ,+ n’ihi na anyị emehiewo Jehova.
15 ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m na-eme ka ha, ya bụ, ndị a, taa ahịhịa ilu,+ m ga-emekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere ihe na-egbu mmadụ;+