11 Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ.+ Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya;+ ọ ga-ekuru ha n’obi ya.+ Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.+
12 Dị ka onye na-azụ ìgwè atụrụ ya si elekọta ha+ n’ụbọchị ọ nọ n’etiti atụrụ ya ndị gbasara agbasa,+ otú ahụ ka m ga-elekọta atụrụ m. M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha n’ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+