5 “‘Gịnị mere m ji hụ ka oké ụjọ jidere ha? Ha na-alaghachi azụ, a na-egwerikwa ndị dike ha; ha agbawo ọsọ, ha eleghịkwa anya n’azụ.+ Ụjọ dị ebe niile,’+ ka Jehova kwuru.
21 Ndị agha o goro ọrụ, bụ́ ndị nọ n’ime ya, yikwara ụmụ ehi mara abụba.+ Ma ha onwe ha atụgharịwo;+ ha niile agbaala ọsọ. Ha eguzolighị.+ N’ihi na ụbọchị ọdachi ha, bụ́ oge a ga-elebara ha anya, abịakwasịwo ha.’+