25 O wee ruo n’ọnwa nke asaa+ na Ishmel+ nwa Netanaya nwa Elishama, bụ́ onye si n’ezinụlọ eze, bịara, ya na ndị agha iri, ha wee gbuo Gedalaya,+ tinyere ndị Juu na ndị Kaldia ya na ha nọ na Mizpa.+
41O wee ruo n’ọnwa nke asaa na Ishmel,+ nwa Netanaya nwa Elishama,+ onye si n’ezinụlọ eze+ na otu n’ime ndị isi na-ejere eze ozi, bịakwutere Gedalaya nwa Ahaịkam n’obodo Mizpa,+ ya na ndị agha iri ọzọ.+ Ha wee rikọta nri ọnụ n’ebe ahụ na Mizpa.+