18 Ma, m ga-ebu ụzọ kwụzuo ha ụgwọ njehie ha+ na ụgwọ mmehie ha, n’ihi na ha merụrụ ala m.+ Ha emewo ka ozu ihe arụ ha na nke ihe ha jọgburu onwe ha jupụta n’ihe nketa m.’”+
17 O wee gaa n’ihu ịsị m: “Ị̀ hụla ihe a, nwa nke mmadụ? Ihe arụ niile ụlọ Juda meworo n’ebe a ọ̀ bụụrụ ha ntakịrị ihe, nke na ha na-eme ka ime ihe ike jupụta n’ala a,+ ka ha wee kpasuo m iwe ọzọ? Lee, ha na-adụ m alaka osisi n’imi.