13 E mesịa, Chineke sịrị Noa: “Ahụla m na ọgwụgwụ nke anụ ahụ́ niile eruwo,+ n’ihi na ụwa jupụtara n’ime ihe ike n’ihi ha; lee, m na-ebibikọta ha na ụwa.+
16 Manase wụfukwara ọbara na-emeghị ihe ọjọọ+ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu, ruo mgbe o mere ka Jeruselem ju n’ọnụ malite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, n’agụnyeghị mmehie ya nke o ji mee ka Juda mehie site n’ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+
4 n’ihi na ha ahapụwo m,+ meekwa ka a ghara ịmatakwa ebe a,+ nọrọkwa n’ime ya na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ, bụ́ chi ha na ndị nna nna ha na ndị eze Juda na-amaghị;+ ha emewo ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta n’ebe a.+
9 O wee sị m: “Njehie ụlọ Izrel na Juda+ dị nnọọ ukwuu,+ ala ha jupụtara n’ịwụfu ọbara,+ obodo ha jupụtakwara n’ihe gbagọrọ agbagọ;+ n’ihi na ha asịwo, ‘Jehova ahapụwo ala a,+ Jehova adịghị ahụ anyị.’+