23 Kọọnụ ihe ndị gaje ime mgbe e mesịrị, ka anyị wee mata na unu bụ chi.+ Ee, unu kwesịrị ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, ka anyị wee legharịa anya hụ ya n’otu mgbe ahụ.+
9 Ndị niile na-eme ihe oyiyi a pịrị apị bụ ihe efu,+ ihe ndị ahụ ha hụrụ n’anya agaghịkwa aba uru ọ bụla.+ Dịkwa ka ndị àmà ha, ha adịghị ahụ ihe ọ bụla, ha amaghịkwa ihe ọ bụla,+ ka ihere wee mee ndị na-eme ha.+
20 “Zukọtanụ bịa.+ Gbakọtanụ bịa nso, unu ndị si ná mba dị iche iche gbapụ.+ Ndị na-ebugharị ihe oyiyi ha e ji osisi pịa amaghị ihe ọ bụla, otú ahụkwa ka ọ dị ndị na-ekpeku chi nke na-apụghị ịzọpụta mmadụ ekpere.+