12 Otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime gị, ọrịa na-efe efe ga-egbu ha,+ ụnwụ ga-ala ha n’iyi n’ime gị.+ Otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ, a ga-eji mma agha gbuo ha gburugburu gị. Otu ụzọ n’ụzọ atọ fọziri ka m ga-achụsasị ebe niile,+ m ga-amịrị mma agha chụwa ha.+
21 “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Otú ahụkwa ka ọ ga-adị mgbe m ga-eweta ihe anọ dị oké egwu m ga-eji kpee ikpe,+ mma agha na ụnwụ na ajọ anụ ọhịa na ọrịa na-efe efe,+ bụ́ ndị m ga-eme ka ha bịakwasị Jeruselem iji bipụ mmadụ na anụ ụlọ nọ n’ime ya.+