25 Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+
9 m ga-emekwa ka ha ghọọ ihe na-akpata ịma jijiji na ndị ọdachi ga-adakwasị n’alaeze niile nke ụwa,+ meekwa ka ha ghọọ ihe nkọcha na ihe e ji atụ ilu na ihe ịkwa emo+ na ihe a bụrụ ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụsasị ha.+
46 “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘A ga-akpọkọta ìgwè mmadụ ka ha bịa buso ha agha,+ a ga-emekwa ka ha ghọọ ihe ga-eme ka a tụọ ụjọ na ihe a ga-ebukọrọ ebukọrọ.+