15 ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m na-eme ka ha, ya bụ, ndị a, taa ahịhịa ilu,+ m ga-emekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere ihe na-egbu mmadụ;+
15 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru megide ndị amụma ahụ: “Lee, m ga-eme ka ha taa ahịhịa ilu, m ga-enyekwa ha mmiri e tinyere ihe na-egbu mmadụ ka ha ṅụọ.+ N’ihi na ịdapụ n’ezi ofufe+ esiwo n’aka ndị amụma nọ na Jeruselem gazuo ala a dum.”