7 m ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m,+ meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.+ A ga-anabata àjà ha a na-esurecha n’ọkụ+ na àjà nkịtị ha+ n’elu ebe ịchụàjà m.+ N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị niile.”+
2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb;+ ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya,+ anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+