24 “Ha ga-apụkwa na-ele ozu nke ndị ahụ nọ na-emehie m;+ n’ihi na ikpuru dị na ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ ha agaghịkwa anyụ anyụ.+ Ha ga-aghọkwara anụ ahụ́ niile ihe na-asọ oyi.”+
12 O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka, ọ ga-edebekwa ebe nzọcha mkpụrụ ya ọcha nke ọma, ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit ya n’ime ụlọ nkwakọba ihe,+ ma ọ ga-esu igbogbo ya ọkụ+ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”