12 Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị ọchịchị aka ike nke mba dị iche iche, ga-egbutu ya. Ndị mmadụ ga-agbahapụkwa ya n’elu ugwu; alaka ya ga-adakwa na ndagwurugwu niile, a ga-agbajikwa alaka ya n’ọwa mmiri niile dị n’ụwa.+ Ndị niile nọ n’ụwa ga-esikwa na ndò ya gbadata wee gbahapụ ya.+