23 Ụmụ Amọn na Moab wee buso ndị bi n’ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu+ agha wee bibie ha ma laa ha n’iyi; ozugbo ha lasịrị ndị bi na Sia n’iyi, ha gburịtara onwe ha.+
22 M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze dị iche iche, mee ka ike alaeze nke mba+ dị iche iche laa n’iyi; m ga-akwatukwa ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-anwụkwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.’”+
13 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ọgba aghara nke si n’aka Jehova ga-adị ebe niile n’etiti ha;+ ha ga-ejidekwa ibe ha, onye ọ bụla ga-ejide aka ibe ya, ha ga-emegidekwa ibe ha.