14 O sikwa n’ihu ụlọ Jehova, nke dị n’agbata ebe ịchụàjà ya na ụlọ Jehova,+ buru ebe ịchụàjà ọla kọpa+ ahụ, ma dọba ya n’akụkụ ebe ugwu nke ebe ịchụàjà ya.
3 O wee matịa ihe yiri aka+ jide m na ntutu isi m. Mmụọ+ wee bulie m bugoo m n’agbata elu ala na eluigwe wee bute m Jeruselem n’ọhụụ Chineke,+ n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ime+ nke chere ihu n’ebe ugwu, n’ebe ihe oyiyi ekworo nke na-akpali ikwo ekworo dị.+