20 Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee! m ga-awụkwasị iwe m na ọnụma m n’ebe a,+ wụkwasịkwa ya ụmụ mmadụ na anụ ụlọ na osisi dị n’ọhịa+ na ihe ala mepụtara; iwe m ga-enwurukwa ọkụ, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+
12 Ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ esiwo n’ụzọ e ji ụkwụ waa n’ala ịkpa bịa. N’ihi na mma agha Jehova na-eripịa ala a, malite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ.+ Udo adịrịghị anụ ahụ́ ọ bụla.