9 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka a ghara ịnụkwa olu aṅụrị na olu obi ụtọ, olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, n’ebe a, n’ihu unu nakwa n’ụbọchị unu.’+
5 “Leenụ anya ná mba niile, legidenụ anya, kporopụnụ anya lewe ibe unu.+ Nọrọnụ n’ijuanya; n’ihi na ọ dị ihe a ga-eme n’ụbọchị unu, nke unu na-agaghị ekweta, ọ bụrụgodị na a kọọrọ ya unu.+