21 N’ihi na Jehova ga-ebili dị ka o biliri n’Ugwu Perezim,+ ọ ga-ewe iwe dị ka o were na ndagwurugwu nke dị nso na Gibiọn,+ ka o wee mee ihe ọ na-eme, ihe ọ na-eme dị ịtụnanya, ka o wee rụọ ọrụ ya, ọrụ ya na-eju anya.+
14 ya mere, lee, ọ bụ m ga-eme ndị a ihe dị ịtụnanya ọzọ,+ n’ụzọ dị ịtụnanya, ee, ihe dị ịtụnanya; amamihe nke ndị ha maara ihe ga-alakwa n’iyi, nghọta nke ndị ha nwere uche ga-ezo onwe ya.”+
41 ‘Hụnụ ya, unu ndị nlelị, ya jukwa unu anya, pụọkwanụ n’anya, n’ihi na ọ dị ọrụ m na-arụ n’ụbọchị unu, bụ́ ọrụ nke unu na-agaghị ekwere ma ọlị ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ ya unu n’ụzọ zuru ezu.’”+