14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
16 Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Egela ntị n’ihe ndị amụma, bụ́ ndị na-eburu unu amụma, na-ekwu.+ Ha na-eme ka unu bụrụ ihe efu.+ Ọ bụ ọhụụ nke si n’obi ha ka ha na-ekwupụta+—ọ bụghị nke si n’ọnụ Jehova.+