14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
28 Ndị amụma ya etewo ha nzụ,+ na-ahụ ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ na-agbara ha afa ụgha,+ sị: “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru,” mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla Jehova kwuru.