Jeremaya
28 O wee ruo n’afọ ahụ, ná mmalite ọchịchị Zedekaya+ bụ́ eze Juda, n’afọ nke anọ, n’ọnwa nke ise, na Hananaya+ nwa Azọ, bụ́ onye amụma si Gibiọn,+ gwara m n’ụlọ Jehova n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu mmadụ niile, sị: 2 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘M ga-agbaji yok eze Babịlọn.+ 3 Afọ abụọ zuru ezu malite ugbu a, m ga-ebulata arịa niile nke ụlọ Jehova ebe a, bụ́ ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn+ si ebe a buga Babịlọn.’” 4 “‘M ga-akpọlata Jekonaya+ nwa Jehoyakim+ bụ́ eze Juda na ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn,’+ ka Jehova kwuru, ‘n’ihi na m ga-agbaji yok+ eze Babịlọn.’”
5 Jeremaya onye amụma wee gwa Hananaya onye amụma okwu n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu ndị niile guzo n’ụlọ Jehova;+ 6 ee, Jeremaya onye amụma sịrị: “Amen!+ Ka Jehova mee otú ahụ! Ka Jehova mezuo ihe i buru n’amụma site n’ibulata arịa ụlọ Jehova, nakwa site n’isi na Babịlọn kpọlata ndị niile a dọọrọ n’agha!+ 7 Otú ọ dị, biko, nụrụ ihe a m na-ekwu ná ntị gị nakwa ná ntị ndị a niile.+ 8 Ndị amụma ndị bu m ụzọ na ndị bu gị ụzọ, malite n’ogologo oge gara aga,+ bukwara amụma banyere ọtụtụ ala na ọtụtụ alaeze ukwu, na agha na ọdachi na ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ha.+ 9 Ma onye amụma nke buru amụma banyere udo,+ a ga-amara na ọ bụ onye amụma Jehova zitere n’ezie mgbe ihe o kwuru mezuru.”+
10 Hananaya onye amụma wee were osisi yok ahụ Jeremaya onye amụma nya n’olu gbajie.+ 11 Hananaya+ wee gaa n’ihu ikwu n’ihu mmadụ niile, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru,+ ‘N’ime afọ abụọ ọzọ zuru ezu, ọ bụ otú a ka m ga-esi gbajie yok Nebukadneza eze Babịlọn bụ́ nke mba niile nya n’olu.’”+ Jeremaya onye amụma wee gawara onwe ya.+
12 Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị,+ mgbe Hananaya onye amụma gbajisịrị osisi yok ahụ Jeremaya onye amụma nya n’olu, sị: 13 “Gaa gwa Hananaya, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ọ bụ yok+ osisi ka ị gbajiri, ị ga-eme yok ígwè wee dochie ya.”+ 14 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “M ga-eme ka mba a niile nyara yok ígwè n’olu, iji jeere Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ozi;+ ha ga-ejere ya ozi.+ M ga-enyefekwa ọbụna anụ ọhịa n’aka ya.”’”+
15 Jeremaya onye amụma wee gwa Hananaya+ onye amụma, sị: “Biko, Hananaya, gee ntị! Ọ bụghị Jehova zitere gị, ma gị onwe gị emewo ka ndị a tụkwasị obi n’okwu ụgha.+ 16 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee! M ga-ewepụ gị n’elu ala. Ị ga-anwụ n’afọ a,+ n’ihi na i jiriwo oké nnupụisi kwuo okwu megide Jehova.’”+
17 Hananaya onye amụma wee nwụọ n’afọ ahụ, n’ọnwa nke asaa.+