30 Ma Saịhọn eze Heshbọn ekweghị ka anyị si n’ala ya gafere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kwere ka mmụọ ya sie ike+ nakwa ka obi kpọọ ya nkụ, ka o wee nyefee ya n’aka gị dị nnọọ ka ọ dị taa.+
51 “Ndị na-ekwesi olu ike na ndị a na-ebighị úgwù n’obi+ na ná ntị, unu na-eguzogide mmụọ nsọ mgbe niile; dị ka nna nna unu hà mere, otú ahụ ka unu na-eme.+