48 Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+
6 Ọ ga-adị ka osisi guzo naanị ya na mbara ọzara, ọ gaghị ahụ mgbe ihe ọma bịara;+ kama ọ ga-ebi n’ebe kpọrọ nkụ n’ala ịkpa, n’ala nnu nke ọ na-adịghị onye bi ya.+