45 Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri na ugwu nsọ nke Ihe Ịchọ Mma;+ ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.+
15 Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta,+ ka o jiri ya gbuo mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke iwe nke ọnụma Chineke,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.