7 Ọ́ bụghị ka i kenye onye agụụ na-agụ ihe oriri,+ ka ị kpọbatakwa ndị nọ n’ahụhụ na ndị na-enweghị ebe obibi n’ụlọ gị?+ Ọ bụrụ na ị hụ onye gba ọtọ, ka i yiwe ya uwe,+ ka ị gharakwa izopụ onwe gị n’ebe onye ikwu gị nọ?+
8 Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+
17 Ma onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ+ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa,+ ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ,+ olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya?+