7 m ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m,+ meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.+ A ga-anabata àjà ha a na-esurecha n’ọkụ+ na àjà nkịtị ha+ n’elu ebe ịchụàjà m.+ N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị niile.”+
3 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-alaghachi na Zayọn+ wee biri n’ime Jeruselem;+ a ga-akpọkwa Jeruselem obodo eziokwu,+ kpọọkwa ugwu Jehova+ nke ụsụụ ndị agha ugwu nsọ.’”+