33 Ndị nwere nghọta+ n’etiti ndị mmadụ ga-eme ka ọtụtụ ndị nwee nghọta.+ A ga-ejikwa mma agha na ire ọkụ mee ka ha daa, meekwa ka ha daa site n’ịdọrọ ha n’agha na ibukọrọ ihe ha,+ ruo ụbọchị ụfọdụ.
3 “Ndị nwere nghọta ga na-enwu dị ka ìhè mbara igwe;+ ndị na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa+ dị ka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.
20 Ma anyị maara na Ọkpara Chineke abịawo,+ o nyewokwa anyị ikike inwe nghọta+ ka anyị wee mara ezi onye ahụ.+ Anyị na ezi onye ahụ dịkwa n’otu,+ site n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Onye a bụ ezi+ Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.+