2 Ndị Eze 17:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Otú ọ dị, eze Asiria chọpụtara izu ọjọọ Hoshia gbara,+ n’ihi na o zigaara Soo bụ́ eze Ijipt+ ndị ozi, o wetaghịkwara eze Asiria ụtụ dị ka ọ na-eme n’afọ ndị gara aga. N’ihi ya, eze Asiria kpọchiri ya ma kee ya agbụ n’ụlọ mkpọrọ.+ Aịzaya 30:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 ndị na-ebili ka ha gaa Ijipt,+ ndị na-ajụghịkwa m ase,+ ndị na-aga ka ha gbaba n’ebe e wusiri ike nke Fero, gbabakwa na ndò Ijipt!+
4 Otú ọ dị, eze Asiria chọpụtara izu ọjọọ Hoshia gbara,+ n’ihi na o zigaara Soo bụ́ eze Ijipt+ ndị ozi, o wetaghịkwara eze Asiria ụtụ dị ka ọ na-eme n’afọ ndị gara aga. N’ihi ya, eze Asiria kpọchiri ya ma kee ya agbụ n’ụlọ mkpọrọ.+
2 ndị na-ebili ka ha gaa Ijipt,+ ndị na-ajụghịkwa m ase,+ ndị na-aga ka ha gbaba n’ebe e wusiri ike nke Fero, gbabakwa na ndò Ijipt!+