23 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ka onye maara ihe ghara iji amamihe ya na-anya isi,+ ka dike ghara iji ike ya na-anya isi.+ Ka ọgaranya ghara iji akụnụba ya na-anya isi.”+
5 ndị zụtara ha gburu ha,+ ọ bụ ezie na ikpe amaghị ha.+ Ndị na-ere ha ere+ na-asịkwa: “Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi. M ga-enweta akụnụba.”+ Ndị na-azụ ha enweghịkwa ọmịiko ọ bụla n’ebe ha nọ.’+
17 N’ihi na ị na-asị: “Abara m ọgaranya,+ enwetawokwa m akụnụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị,” ma ị maghị na ị nọ ná nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì+ na onye gba ọtọ,