Ilu
28 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe ọ na-enweghị onye na-achụ ha,+ ma ndị ezi omume dị ka nwa ọdụm nke nwere obi ike.+
2 N’ihi iwu obodo na-emebi, ndị isi ya bụ́ ndị na-anọchi ibe ha na-adị ọtụtụ,+ ma onye nwere nghọta, nke makwaara ihe ziri ezi, ga-eme ka onyeisi chịa ogologo oge.+
3 Nwoke bụ́ ogbenye nke na-erigbu+ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha yiri mmiri ozuzo nke na-ekpochapụ ihe wee mee ka ihe oriri ghara ịdị.
4 Ndị na-ahapụ iwu na-eto onye ajọ omume,+ ma ndị na-edebe iwu na-agbaso ha mgba.+
5 Ndị na-eme ihe ọjọọ apụghị ịghọta ikpe ziri ezi, ma ndị na-achọ Jehova pụrụ ịghọta ihe niile.+
6 Onye dara ogbenye, nke na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe, dị mma karịa onye ọ bụla nke gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya, n’agbanyeghị na ọ bara ọgaranya.+
7 Nwa nke nwere nghọta na-edebe iwu,+ ma onye ya na ndị na-eribiga ihe ókè na-akpakọrịta na-emenye nna ya ihere.+
8 Onye na-amụba ihe onwunwe ya site n’ịnara ọmụrụ nwa+ na ụma na-akpakọbara ya onye na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha amara.+
9 Onye na-ewepụ ntị ya ka ọ ghara ịnụ iwu+—ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.+
10 Onye na-eme ka ndị ziri ezi kpafuo+ banye n’ụzọ ọjọọ, ya onwe ya ga-adaba n’olulu nke ya,+ ma ndị na-enweghị ntụpọ ga-enweta ihe ọma.+
11 Ọgaranya maara ihe n’anya onwe ya,+ ma onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nke nwere nghọta na-achọpụta ihe bụ́ eziokwu banyere ya.+
12 Mgbe ndị ezi omume na-aṅụrị ọṅụ,+ ọ na-abụ ihe magburu onwe ya; ma mgbe ndị ajọ omume biliri, ndị mmadụ na-eme ka a ghara ịmata ndị ha bụ.+
13 Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma,+ ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.+
14 Obi ụtọ na-adịrị onye ụjọ na-atụ mgbe niile,+ ma onye na-akpọchi obi ya ga-adaba n’oké nsogbu.+
15 Dị ka ọdụm nke na-ebigbọ ebigbọ na anụ ọhịa bea nke ji oké ọsọ na-abịa, otú ahụ ka ajọ mmadụ nke na-achị ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha dị.+
16 Onye ndú nke na-enweghị ezi nghọta jupụtakwara n’omume aghụghọ,+ ma onye kpọrọ uru na-ezighị ezi asị+ ga-eme ka ụbọchị ndụ ya dị ogologo.
17 Onye ikpe ọmụma nke ọbara mkpụrụ obi ọ wụfuru na-anyịgbu, ya onwe ya ga-agbaba n’olulu.+ Ka onye ọ bụla ghara igbochi ya.
18 Onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ ka a ga-azọpụta,+ ma onye e mere ka ọ gbagọọ agbagọ n’ụzọ ya ga-ada ozugbo.+
19 Onye na-akọ ubi nke ya ga-enwe ihe oriri ga-ezuru ya,+ onye na-achụso ihe na-abaghị uru ga-adagbukwa onwe ya n’ogbenye.+
20 Onye na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzi,+ ma onye ọ dị ngwa ngwa ịba ọgaranya agaghị abụ onye aka ya dị ọcha.+
21 Ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma,+ ọ dịghịkwa mma ka dimkpa mmadụ jehie n’ihi ibé achịcha efu.
22 Onye anyaụfụ na-achụsosi ihe dị oké ọnụ ahịa ike,+ ma ọ maghị na ya ga-anọ n’ụkọ.
23 Onye na-abara mmadụ mba+ ga-emesị nweta ihu ọma karịa onye na-eji ire ya eto mmadụ otuto efu.
24 Onye na-apụnara nna ya na nne ya ihe+ ma na-asị: “Ọ bụghị ihe ọjọọ,”+ bụ enyi nke onye na-akpata mbibi.
25 Onye mkpụrụ obi ya dị nganga na-akpalite esemokwu,+ ma a ga-eme ka onye dabeere n’ebe Jehova nọ maa abụba.+
26 Onye tụkwasịrị obi n’obi nke ya dị nzuzu,+ ma onye na-eje ije n’amamihe ga-alanahụ.+
27 Onye na-enye onye dara ogbenye ihe agaghị anọ n’ụkọ,+ ma onye na-ewepụ anya ya ga-enweta ọtụtụ ọbụbụ ọnụ.+
28 Mgbe ndị ajọ omume biliri, ndị mmadụ na-ezo;+ ma mgbe ha lara n’iyi, ndị ezi omume na-adị ọtụtụ.+