7 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Jirinụ oké olu tikuo Jekọb mkpu ọṅụ, tisienụ mkpu ike dị ka ndị bụ́ ndị isi nke mba dị iche iche.+ Kọsaanụ ya.+ Nyenụ ya otuto, sị, ‘Jehova, zọpụta ndị gị, bụ́ ndị fọdụụrụ Izrel.’+
6 M ga-eme ka ụlọ Juda dị elu, m ga-azọpụtakwa ụlọ Josef.+ M ga-enye ha ebe obibi, n’ihi na m ga-emere ha ebere;+ ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị ajụ;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha, m ga-anụkwa olu ha.+