7 site n’ịghara iso mba ndị a na-akpakọrịta,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu. Unu akpọtụkwala chi ha aha,+ unu ejikwala ha ṅụọ iyi,+ unu efekwala ha ofufe, unu akpọkwarala ha isiala.+
5 Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ n’ihi arụsị nwa ehi nke Bet-even;+ n’ihi na ndị ya ga-eruru ya uju, tinyere ndị nchụàjà chi ala ọzọ ya, bụ́ ndị na-enwebu aṅụrị n’ihi ya, n’ihi ebube ya, n’ihi na a ga-esi n’ebe ha nọ dọrọ ya n’agha.+