Hosia
10 “Izrel bụ osisi vaịn mebiri emebi.+ Ọ na-amịrị onwe ya mkpụrụ.+ Dị ka mkpụrụ ọ mịrị dị ọtụtụ, otú ahụ ka ọ rụworo ọtụtụ ebe ịchụàjà.+ Dị ka ala ya dị mma, otú ahụ ka ha gwunyeworo ogidi ndị mara mma.+ 2 Obi ha dị aghụghọ;+ ugbu a, a ga-ama ha ikpe.
“E nwere onye ga-akwatu ebe ịchụàjà ha dị iche iche; ọ ga-ebukọrọ ogidi ha.+ 3 N’ihi na ugbu a ha ga-asị, ‘Anyị enweghị eze,+ n’ihi na anyị atụghị egwu Jehova. Gịnị ka eze ga-emere anyị?’
4 “Ha na-ekwu naanị okwu, na-aṅụ iyi ụgha,+ na-agba ndụ;+ ikpe epuola dị ka ahịhịa na-egbu mmadụ nke puru n’ebe a kọrọ ihe.+ 5 Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ n’ihi arụsị nwa ehi nke Bet-even;+ n’ihi na ndị ya ga-eruru ya uju, tinyere ndị nchụàjà chi ala ọzọ ya, bụ́ ndị na-enwebu aṅụrị n’ihi ya, n’ihi ebube ya, n’ihi na a ga-esi n’ebe ha nọ dọrọ ya n’agha.+ 6 A ga-eburukwa ya gaa Asiria ka ọ bụrụ onyinye a ga-enye eze ukwu.+ Ọ bụ ihere ka Ifrem ga-enweta,+ ndụmọdụ Izrel ga-eme ya onwe ya ihere.+ 7 Sameria na eze ya ga-ala n’iyi,+ dị ka ome a gbajipụrụ agbajipụ nke tọgbọ n’elu mmiri. 8 A ga-ala ebe ndị dị elu dị na Bet-even,+ bụ́ mmehie Izrel,+ n’iyi. Ogwu na uke+ ga-etochi ebe ịchụàjà ha.+ Ndị mmadụ ga-asịkwa ugwu ukwu, ‘Kpuchie anyị!’ sịkwa ugwu nta, ‘Dakwasị anyị!’+
9 “Izrel, i mehiewo+ malite n’ụbọchị Gibia.+ Ha esighị n’ebe ahụ pụọ. Agha e busoro ụmụ ajọ omume eruteghị ha na Gibia.+ 10 M ga-ata ha ahụhụ mgbe m chọrọ.+ M ga-akpọkọta ndị dị iche iche imegide ha, mgbe a ga-ekokwasị ha njehie abụọ ha.+
11 “Ifrem bụ nwa ehi e nyere ọzụzụ nke ịzọcha mkpụrụ na-atọ ụtọ;+ mụ onwe m gabigara olu ya mara mma. M ga-eme ka mmadụ nọkwasị n’Ifrem.+ Juda ga-akọ ihe;+ Jekọb ga-egburiri ya ala.+ 12 Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume;+ jirinụ obiọma* ghọọ mkpụrụ.+ Kọọnụ ala ubi unu,+ mgbe oge ka dị ịchọ Jehova ruo mgbe ọ ga-abịa+ nye unu ntụziaka n’ezi omume.+
13 “Unu akọwo ihe ọjọọ dị ka ubi.+ Unu aghọrọwo ajọ omume.+ Unu eriwo mkpụrụ aghụghọ,+ n’ihi na unu tụkwasịrị ụzọ unu obi,+ tụkwasịkwa ọtụtụ ndị dike unu obi.+ 14 E nwewo ọgba aghara n’etiti ndị gị,+ a ga-ebukọrọ ihe niile dị n’obodo gị ndị e wusiri ike+ otú ahụ Shalman bukọọrọ n’ụlọ Abel, n’ụbọchị agha, mgbe a kụriri otu nwaanyị na ụmụ ya.+ 15 Betel, otú a ka a ga-eme unu, n’ihi ihe ọjọọ unu nke gabigara ókè.+ Mgbe chi bọrọ, a ga-ala eze Izrel n’iyi.”+