21 Ebuuru m mmehie ahụ unu mere, ya bụ, nwa ehi+ ahụ, m wee kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya, m gweriri ya nke ọma ruo mgbe ọ dị ka uzuzu; e mesịa, m wụnyere ntụ ya n’ime iyi nke si n’ugwu ahụ na-asọdata.+
28 Ya mere, eze natara ndụmọdụ+ wee mee nwa ehi ọlaedo abụọ+ ma gwa ndị ahụ, sị: “Ọ bụ ihe siri ike nke ukwuu unu ịgbagowe Jeruselem. Lee Chineke gị,+ Izrel, nke kpọpụtara gị n’ala Ijipt.”+
5 “Ọ bụ nnupụisi Jekọb mere ihe a niile ji na-eme, ọbụna n’ihi mmehie nke ụlọ Izrel.+ Gịnị bụ nnupụisi Jekọb? Ọ́ bụghị Sameria?+ Gịnịkwa bụ ebe ndị dị elu nke Juda?+ Ọ̀ bụ na ha abụghị Jeruselem?