Jeremaya 20:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 M wee sị: “Agaghị m ekwu okwu banyere ya, agakwaghị m ekwu okwu n’aha ya.”+ Ma n’ime obi m, ọ dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m; ike wee gwụ m ịgbachi nkịtị, enweghịkwa m ike idi ya.+ Emọs 7:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Jehova wee si n’ebe m nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ kpọrọ m. Jehova wee gaa n’ihu ịsị m, ‘Gaa buoro ndị m bụ́ Izrel amụma.’+ Ọrụ Ndịozi 4:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Ma anyị onwe anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.”+ Ọrụ Ndịozi 5:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 “Gawanụ, mgbe unu guzoro n’ụlọ nsọ, nọgidenụ na-agwa ndị mmadụ okwu niile metụtara ndụ a.”+
9 M wee sị: “Agaghị m ekwu okwu banyere ya, agakwaghị m ekwu okwu n’aha ya.”+ Ma n’ime obi m, ọ dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m; ike wee gwụ m ịgbachi nkịtị, enweghịkwa m ike idi ya.+
15 Jehova wee si n’ebe m nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ kpọrọ m. Jehova wee gaa n’ihu ịsị m, ‘Gaa buoro ndị m bụ́ Izrel amụma.’+