13 “Akpaliwo m otu onye n’ezi omume,+ m ga-emekwa ka ụzọ ya niile kwụrụ ọtọ.+ Ọ bụ ya ga-ewu obodo m,+ ọ ga-ahapụkwa ndị m a dọọrọ n’agha ka ha laa,+ ọ bụghị ka e wee kwụọ ya ụgwọ,+ ọ bụghịkwa ka e wee nye ya ngarị,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.