8 Kama ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya,+ nakwa na ọ na-edebe iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà,+ mere Jehova ji jiri aka dị ike kpọpụta unu,+ ka o wee napụta unu n’ụlọ ndị ohu,+ n’aka Fero eze Ijipt.
23 Oleekwa mba dị n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel,+ bụ́ ndị Chineke gara gbapụtara onwe ya ka ha bụrụ ndị ya,+ iji meere onwe ya aha+ nakwa iji meere ha oké ihe na ihe dị egwu+—iji chụpụ mba dị iche iche na chi ha n’ihi ndị gị, bụ́ ndị i si n’Ijipt gbapụtara+ onwe gị?