4 otú ahụ ka eze Asiria ga-esi duru ndị Ijipt+ a dọọrọ n’agha nakwa ndị Itiopia a chụpụrụ n’ala ha, ma ụmụaka ma ndị agadi, ndị gba ọtọ, gbarakwa ụkwụ efu, ndị ikè ha ghekwara oghe, bụ́ ọtọ Ijipt.+
29Ihe ndị a bụ ihe dị n’akwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si na Jeruselem zigara ndị okenye fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha na ndị nchụàjà na ndị amụma nakwa mmadụ niile, bụ́ ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn,+