15 Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha wee na-ezigara ha ndị ozi ya+ ka ha dọọ ha aka ná ntị, o zigara ha ugboro ugboro, n’ihi na o nweere ndị ya ọmịiko,+ nweekwa ọmịiko maka ebe obibi ya.+
26 Onye na-eme ka okwu ohu ya mezuo, Onye na-emezucha atụmatụ nke ndị ozi ya;+ Onye na-ekwu banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ebi na ya,’+ kwuokwa banyere obodo ndị dị na Juda, sị, ‘A ga-ewughachi ha,+ m ga-ewu ebe ya niile tọgbọrọ n’efu’;+