2 Ọ bụ mgbe ahụ ka Zerọbabel+ nwa Shieltiel+ na Jeshụa+ nwa Jehọzadak biliri wee malite iwughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ndị amụma Chineke,+ bụ́ ndị na-enyere ha aka, sokwa ha.
9 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Unu ndị na-anụ n’ụbọchị ndị a ihe ndị amụma na-ekwu,+ meenụ ka aka unu dị ike+ n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha, iji wuo ụlọ nsọ ahụ.+