41O wee ruo n’ọnwa nke asaa na Ishmel,+ nwa Netanaya nwa Elishama,+ onye si n’ezinụlọ eze+ na otu n’ime ndị isi na-ejere eze ozi, bịakwutere Gedalaya nwa Ahaịkam n’obodo Mizpa,+ ya na ndị agha iri ọzọ.+ Ha wee rikọta nri ọnụ n’ebe ahụ na Mizpa.+
2 Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom iri ahụ ya na ha so wee bilie jiri mma agha gbuo Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan.+ O wee gbuo onye eze Babịlọn mere onyeisi ala.+