4 Unu na-ebu ọnụ iji na-ese okwu ma na-alụ ọgụ,+ nakwa iji na-akụ ajọ ọkpọ.+ Ọ̀ bụ na unu anọghị na-ebu ọnụ ma na-eche na ọ bụ mgbe a ga-anọ n’elu nụ olu unu?
16 “Mgbe unu na-ebu ọnụ,+ kwụsịnụ ịgbarụ ihu dị ka ndị ihu abụọ, n’ihi na ha na-emebi ihu ha ka ndị mmadụ wee hụ na ha na-ebu ọnụ.+ N’ezie, ana m asị unu, Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha.
23 A na-egosipụta ihe ndị ahụ n’ụdị ofufe nke mmadụ na-amanye onwe ya ịgbaso, n’ịdị umeala n’obi ụgha, nakwa n’ịta onwe onye ahụhụ.+ N’ezie, e nwere ihe yiri amamihe na ha, ma ọ dịghị uru ha bara n’ịlụso ọchịchọ anụ ahụ́ ọgụ.+