10 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m na-emegide ndị ọzụzụ atụrụ.+ M ga-ajụta atụrụ m n’aka ha, meekwa ka ha kwụsị ịzụ atụrụ m.+ Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ agakwaghị azụ onwe ha.+ M ga-anapụtakwa atụrụ m n’ọnụ ha, ha agaghịkwa abụrụ ha nri.’”+