8 “‘Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “‘Ebe ọ bụ na unu ekwuwo ihe na-abụghị eziokwu, unu ahụwokwa ụgha n’ọhụụ, n’ihi ya, m na-emegide unu,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”
3 “M na-eweso ndị ọzụzụ atụrụ iwe dị ọkụ,+ m ga-emekwa ka ndị ndú na-akpọ ekwo nkụ dị ka ewu+ zaa ajụjụ;+ n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha echewo ihu ya n’ebe ìgwè atụrụ ya,+ bụ́ ụlọ Juda, nọ, o mewokwa ka ha dị ka ịnyịnya+ ya nke dị ebube n’agha.