31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ndọba oriọna. Ị ga-akpụ ihe ndọba oriọna ahụ akpụ.+ Ụkwụ ya, alaka ya, iko ya, isi ya nakwa ifuru ya ga-esi n’ahụ́ ya pụta.
49 na ihe ndọba oriọna+ ndị e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee,+ ise n’aka nri nakwa ise n’aka ekpe n’ihu ọnụ ụlọ dị n’ime ime, tinyere okooko+ ya na oriọna+ ya na ihe ndị e ji asọnyụ ọkụ,+ bụ́ ndị e ji ọlaedo mee,