Ọpụpụ
25 Jehova wee gwa Mozis,+ sị: 2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye: Onye ọ bụla obi ya kpaliri inye m onyinye ka unu ga-anata onyinye m.+ 3 Nke a bụ onyinye unu ga-anata ha: ọlaedo+ na ọlaọcha+ na ọla kọpa,+ 4 eri na-acha anụnụ anụnụ, na ajị anụ e sijiri odo odo, na eri na-acha uhie uhie, na ezigbo ákwà linin, na ajị ewu,+ 5 na akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, na akpụkpọ anụ sil, na osisi akeshịa;+ 6 mmanụ maka ihe ọkụ,+ mmanụ bọlsọm+ maka ite mmadụ mmanụ+ nakwa maka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ;+ 7 na nkume ọnịks na nkume ndị a ga-akwụnye n’efọd+ nakwa ndị a ga-akwụnye n’akpa obi.+ 8 Ha ga-arụkwara m ebe nsọ, n’ihi na m ga-ebi n’etiti ha.+ 9 Dị ka ihe niile m na-egosi gị nke bụ́ ụkpụrụ a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ na ụkpụrụ a ga-eji rụọ ihe niile ga-adị n’ime ya, otú ahụ ka unu ga-arụ ya.+
10 “Ha ga-eji osisi akeshịa rụọ Igbe+ nke ga-adị kubit abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu. 11 Ị ga-ejikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+ Ị ga-amachi ya ime na azụ, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+ 12 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka maka ya ma rụnye ha n’elu ụkwụ ya anọ, abụọ ga-adị n’otu akụkụ ya, abụọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ.+ 13 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi ma were ọlaedo machie ha.+ 14 Ị ga-etinyekwa okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka bụ́ ndị dị n’akụkụ Igbe ahụ, ka e jiri ha na-ebu Igbe ahụ. 15 N’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka bụ́ ndị a rụnyere n’Igbe ahụ ka okporo osisi ndị ahụ ga na-adị. A gaghị ewepụ ha ewepụ.+ 16 Ị ga-etinyekwa ihe àmà m ga-enye gị n’ime Igbe ahụ.+
17 “Ị ga-ejikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe mkpuchi ya nke ga-adị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 18 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ cherọb abụọ. Ị ga-akpụnye ha na nsọtụ abụọ nke ihe mkpuchi ahụ.+ 19 Kpụnye otu cherọb n’otu nsọtụ nakwa otu cherọb na nsọtụ nke ọzọ.+ Ọ bụ n’elu ihe mkpuchi ahụ ka ị ga-akpụnye cherọb ndị ahụ na nsọtụ ya abụọ. 20 Cherọb ndị ahụ ga-achịli nku ha abụọ elu, nku ha ga-asachi ihe mkpuchi ahụ, otu ga-eche ibe ya ihu.+ Ihu cherọb ndị ahụ ga-ekpudokwa n’ihe mkpuchi ahụ. 21 Ị ga-ewerekwa ihe mkpuchi+ ahụ kpuchie Igbe ahụ, n’ime Igbe ahụ ka ị ga-etinyekwa ihe àmà m ga-enye gị. 22 M ga-apụta ìhè n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu ihe mkpuchi ahụ gwa gị okwu,+ n’agbata cherọb abụọ ahụ dị n’elu igbe ihe àmà ahụ, bụ́ ihe niile m ga-enye gị n’iwu maka ụmụ Izrel.+
23 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ otu tebụl+ nke ga-adị kubit abụọ n’ogologo, otu kubit n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu. 24 Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+ 25 Ị ga-akpụ ihe ga-aha ka uhiè ọbụ aka mmadụ gburugburu ọnụ ya, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ihe ahụ ị ga-akpụ n’ọnụ ya.+ 26 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka maka ya ma rụnye ha n’akụkụ anọ ya bụ́ ebe ụkwụ anọ ya ga-adị.+ 27 Ihe ndị ahụ yiri mgbaaka ga-adị n’akụkụ ihe ahụ a ga-akpụ n’ọnụ ya ka ọ bụrụ ihe ga na-ejide okporo osisi ndị a ga-eji na-ebu tebụl ahụ.+ 28 Ị ga-ejikwa osisi akeshịa rụọ okporo osisi ndị ahụ ma were ọlaedo machie ha, ha ga-eji ha na-ebu tebụl ahụ.+
29 “Ị ga-arụ efere ya na iko ya na ihe mmiri ya na ọkwá ya bụ́ ndị ha ga-eji na-awụsa àjà ihe ọṅụṅụ. Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ha.+ 30 Ị ga na-edebe achịcha a na-eche n’ihu m n’elu tebụl ahụ mgbe niile.+
31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ndọba oriọna. Ị ga-akpụ ihe ndọba oriọna ahụ akpụ.+ Ụkwụ ya, alaka ya, iko ya, isi ya nakwa ifuru ya ga-esi n’ahụ́ ya pụta. 32 Alaka isii ga-esi n’akụkụ ya abụọ pụta, alaka atọ nke ihe ndọba oriọna ahụ ga-esi n’otu akụkụ ya pụta, alaka atọ nke ihe ndọba oriọna ahụ ga-esikwa n’akụkụ ya nke ọzọ pụta.+ 33 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu mpaghara ya, otu isi na otu ifuru ga-adị n’agbata otu iko na iko ibe ya, iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adịkwa n’alaka nke ọ bụla dị ná mpaghara ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru ga-adị n’agbata otu iko na iko ibe ya.+ Otú a ka alaka isii ndị ga-esi n’ihe ndọba oriọna ahụ pụta ga-adị. 34 A ga-enwe iko anọ ndị yiri okooko almọnd n’ihe ndọba oriọna ahụ, otu isi na otu ifuru ga-adị n’agbata otu iko na iko ibe ya.+ 35 Otu isi nke ga-adị n’okpuru alaka abụọ ga-esi na ya pụta, otu isi nke ga-adị n’okpuru alaka abụọ ọzọ ga-esi na ya pụta, otu isi nke ga-adị n’okpuru alaka abụọ ọzọ ga-esikwa na ya pụta, bụ́ alaka isii ndị ga-esi n’ihe ndọba oriọna ahụ pụta.+ 36 Isi ha na alaka ha ga-esi n’ahụ́ ya pụta. Ha dum bụ otu ihe nke e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa+ kpụọ. 37 Ị ga-akpụ oriọna asaa maka ya; a ga na-amụnye oriọna ndị ahụ amụnye, ha ga na-enwukwa n’ihu ebe ọ dị.+ 38 A ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe ịsọnyụ ọkụ ya nakwa ihe ịgụ ọkụ ya.+ 39 Ọ ga-eji otu talent ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ya, ya na arịa ya ndị a niile. 40 Hụ na i mere ha dị ka ụkpụrụ ha nke e gosiri gị n’ugwu a+ si dị.