41 Onye na-anabata onye amụma n’ihi na ọ bụ onye amụma ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye amụma,+ onye na-anabatakwa onye ezi omume n’ihi na ọ bụ onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.+
52 Ya mere, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ otú ahụ, onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha, mgbe e ziri ya ihe banyere alaeze eluigwe,+ yiri nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.”+