7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+
63 Ma Jizọs gbachiri nkịtị.+ Ya mere, nnukwu onye nchụàjà ahụ sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi+ na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst,+ Ọkpara Chineke!”